[1] Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn okwu sị,
[2] “Gụọ ọnụ chọpụta, ọnụọgụgụ ụmụ Kohat dị nʼebo Livayị dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
[3] Gụọ ndị ikom niile gbarala iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị tozuru ije ozi nʼụlọ nzute.
[4] “Nke a bụ ọrụ dịrị ndị Kohat nʼụlọ nzute, ilekọta ihe ndị ahụ kachasị ịdị nsọ.
[5] Mgbe ọmụma ụlọ ikwu ahụ ga-ebili ije ha, Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eburu ụzọ banye nʼụlọ nzute ahụ wetuo akwa mgbochi ahụ, jiri ya kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.
[6] Mgbe ahụ, ha ga-agbakwasị akpụkpọ anụ ehi mmiri nʼelu akwa mgbochi ahụ, sakwasịkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ nʼelu ya, tinyekwa mkpọrọ osisi niile nʼoghere ha kwesiri ịdị.
[7] “Nʼelu tebul ahụ na-adị nʼihu Onyenwe anyị, ha ga-agbasa akwa anụnụ anụnụ tụkwasịkwa efere niile, ngaji niile, ọkwa niile na iko aja ihe ọṅụṅụ. Achịcha ahụ na-adịgide nʼelu ya ga-adịkwa ebe ọ dị.
[8] Ha ga-agbasakwa akwa uhie nʼelu ya, jiri akpụkpọ anụ ehi mmiri gbokwasịkwa nʼelu akwa uhie ahụ. Mgbe ahụ, ha ga-etinyekwa mkpọrọ osisi e ji ebu tebul nʼime oghere o kwesiri ịdị.
[9] “Ọzọ, ha ga-eji akwa anụnụ anụnụ sachie ihe ịdọba oriọna ahụ nke na-enye ìhè, ya na oriọna ya niile, mkpa ya niile na ihe ịkpakepụ ọkụ ya niile na ite mmanụ ya niile, e ji awụnye ya mmanụ.
[10] Emesịa, ha ga-eji akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ya na ngwongwo ya niile, tụkwasị ya nʼelu ihe e ji ebu ya.
[11] “Ha ga-ejikwa akwa anụnụ anụnụ tụsaa nʼelu ebe ịchụ aja ahụ e jiri ọlaedo mee, werekwa akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ya, tinyekwa mkpọrọ osisi e ji ebu ya nʼoghere dị nʼakụkụ ebe ịchụ aja ahụ.
[12] “Ihe ndị ọzọ niile e ji eje ozi nʼebe nsọ ahụ ka ha ga-eji akwa anụnụ anụnụ kekọtaa, jirikwa akpụkpọ anụ ehi mmiri sachie ha, tụkwasị ha nʼelu ihe e ji ebu ha.
[13] “A ga-ekpopụ ntụ dị nʼebe ịchụ aja bronz ahụ, jiri akwa na-acha ngwakọta anụnụ na uhie, sachie ebe ịchụ aja bronz ahụ.
[14] Emesịa ha ga-atụkwasị ihe niile e ji eje ozi nʼebe ịchụ aja ahụ nʼelu akwa ahụ, ihe dịka ite ịgụ ọkụ, na ndụdụ, na ihe ikpofu ntụ, na efere ịkwọsa mmiri niile. Akpụkpọ anụ ehi mmiri ka a ga-eji sachie ha niile. Ma nʼikpeazụ, mkpọrọ osisi e ji ebu ya ka a ga-etinye nʼebe ha kwesiri ịdị.
[15] “Mgbe Erọn na ụmụ ya kpuchisịrị ụlọnsọ ahụ na ngwongwo niile nke ebe nsọ ahụ, dịka ndị Izrel niile na-ejikere ibili ije, mgbe ahụ ka ndị Kohat ga-abata buru ihe ndị a. Ma ha agaghị emetụ ihe nsọ ndị a aka ka ha ghara ịnwụ. Ọrụ ibu ihe ndị a niile dị nʼime ụlọ nzute dịrị Ndị Kohat.
[16] “Elieza nwa Erọn, onye nchụaja, ka ọrụ ndị a dị nʼaka: mmanụ e ji amụ ọkụ, na ihe nsure ọkụ e ji ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ mee, na onyinye mkpụrụ ọka a na-enye ụbọchị niile, na mmanụ nsọ ahụ. Nʼaka ya ka ọrụ metụtara nlekọta ụlọ nzute ahụ niile, ihe niile dị nʼime ya na ngwongwo nsọ ya dị iche iche dị.”
[17] Onyenwe anyị gwara Mosis na Erọn sị,
[18] “Unu ekwekwala ka agbụrụ Kohat bụrụ ndị e bipụrụ site nʼebo Livayị.
[19] Otu a ka unu ga-esi meso ha mmeso ime ka ha dịrị ndụ, ghara ịnwụ, mgbe ha bịara nso ihe ndị ahụ dịkarịsịrị nsọ, Erọn na ụmụ ya ga-esoro ha banye gosi onye ọ bụla nʼime ha ihe ha ga-ebu.
[20] Ma ndị Kohat ekwesighị ịbanye ilekwasị ihe nsọ ndị ahụ anya, ka ha ghara ịnwụ.”
[21] Mgbe ahụ Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,
[22] “Gụọ ọnụ chọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Geshọn, dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
[23] Mata ọnụọgụgụ ndị ikom ole ha dị, ndị kwesiri ịrụ ọrụ nʼụlọ nzute, ndị gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise.
[24] “Ihe ga-abụ ọrụ ndị ikwu Geshọn ga-abụ ije ozi na ibu ibu.
[25] Ha ga-ebu akwa mgbochi ebe obibi ahụ na nke ụlọ nzute ahụ, tinyere akwa e ji sachie ya na akpụkpọ anụ ehi mmiri e ji mee elu ụlọ ya na akwa mgbochi dị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ.
[26] Ha ga-ebukwa akwa mgbochi niile e ji gechie ogige ahụ, akwa e ji gechie ọnụ ụzọ ama ogige gbara ebe ịchụ aja na ụlọ nzute ahụ gburugburu, ụdọ ya niile na ngwongwo niile e ji eje ozi.
[27] Ọrụ ha niile, maọbụ ibu ihe ma ọ bụkwanụ ịrụ ọrụ ọzọ, ga-abụ site na ntụziaka Erọn na ụmụ ya. Ị ga-ekenye ha ọrụ dịrị ha nʼihe niile bụ ihe ha ga-ebu.
[28] Nke a bụ ọrụ dịịrị ikwu Geshọn nʼụlọ nzute. Ha ga-anọ nʼokpuru Itama, nwa Erọn, onye nchụaja, onye bụ onyeisi ha.
[29] “Gụọ, chọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Merari dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
[30] Chọpụta ọnụọgụgụ ndị ikom ole ha dị, ndị gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ịrụ ọrụ nʼụlọ nzute Onyenwe anyị.
[31] Ije ozi ha dịka o si metụta ọrụ ụlọ nzute bụ ibu mbudo ụlọ nzute ahụ niile, osisi ntụbichi ya niile, ogidi osisi na ụkwụ ya niile;
[32] tinyere ogidi osisi niile dị ogige ahụ gburugburu na ụkwụ ha niile, ǹtu niile, ụdọ ha niile na ngwongwo ndị ọzọ e ji arụ ọrụ metụtara ihe ndị a ha ga-ebu. Kenye nwoke ọbụla ọrụ nke ya. Kpọ onye ahụ aha nye ya ọrụ nke ya.
[33] Nke a bụ ọrụ dịịrị ndị agbụrụ Merari mgbe ha na-aga ozi ha nʼụlọ nzute. Ha ga-anọ nʼokpuru Itama, nwa Erọn, onye nchụaja, onye bụ onyeisi ha.”
[34] Ya mere, Mosis na Erọn na ndị ndu nzukọ ụmụ Izrel gụrụ ma chọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Kohat, dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
[35] Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ije ozi nʼụlọ nzute ahụ
[36] dịka ikwu ha si dị bụ puku abụọ na narị asaa na iri ise (2,750).
[37] Ndị a niile bụ ndị si nʼikwu Kohat ndị na-eje ozi nʼụlọ nzute. Mosis na Erọn gụrụ ha ọnụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
[38] A gụrụ ụmụ Geshọn ọnụ dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
[39] Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ije ozi nʼụlọ nzute,
[40] dịka ikwu ha si dị bụ puku abụọ na narị isii na iri atọ (2,630).
[41] Ndị a niile bụ ndị si nʼikwu Geshọn ndị na-eje ozi nʼụlọ nzute. Mosis na Erọn gụrụ ha ọnụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
[42] A gụrụ ụmụ Merari ọnụ dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
[43] Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise ndị toruru ije ozi nʼụlọ nzute
[44] dịka ikwu ha si dị bụ puku atọ na narị abụọ (3,200).
[45] Ndị a niile bụ ndị si nʼikwu Merari ndị na-eje ozi nʼụlọ nzute. Mosis na Erọn gụrụ ha ọnụ dịka iwu Onyenwe anyị nyere Mosis si dị.
[46] Otu a ka Mosis na Erọn na ndị ndu ụmụ Izrel si gụọ ndị Livayị niile ọnụ dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.
[47] Ndị ikom niile gbara iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị toruru ije ozi na ibu ụlọ nzute ahụ
[48] dị puku asatọ na narị ise na iri asatọ (8,580).
[49] Dịka iwu Onyenwe anyị nyere site nʼaka Mosis si dị, e kenyere onye ọbụla ọrụ ya ma gwa ya ihe o kwesiri ibu. A gụrụ ha ọnụ dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu.