[1] Nʼoge a Herọd eze na-achị Galili nụrụ ihe banyere Jisọs.
[2] Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi okwu sị ha, “Onye a bụkwanụ Jọn omee baptizim. O sitela na ndị nwụrụ anwụ bilie dịkwa ndụ ọzọ. Ọ bụ ya mere ike ịrụ ọrụ ebube ndị a ji dị nʼime ya.”
[3] Nʼihi na, Herọd jidere Jọn kee ya agbụ tinye ya nʼụlọ mkpọrọ, nʼihi Herodịas nwunye Filip nwanne ya nwoke.
[4] Nʼihi na Jọn gwara ya, “Ọ bụghị ihe ziri ezi nʼiwu ka ị kpọrọ ya.”
[5] Herọd chọrọrị igbu ya, ma ọ tụrụ egwu ndị mmadụ, nʼihi na ha weere Jọn dị ka onye amụma.
[6] Ma mgbe a na-eme mmemme icheta ọmụmụ Herọd, ada Herodịas tere egwu nʼihu Herọd, na nʼihu ndị ọbịa bịara nʼụbọchị ahụ. Obi tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu.
[7] Nke a mere o ji ṅụọ iyi kwee nkwa inye ya ihe ọbụla ọ rịọrọ.
[8] Ma dị ka nne ya si haziere ya, ọ rịọrọ eze Herọd sị, “Nye m isi Jọn omee baptizim nʼefere ugbu a.”
[9] Arịrịọ a wutere eze Herọd, ma nʼihi iyi ọ ṅụrụ na nʼihi ndị ọbịa ya niile, ọ chọghị ịla azụ nʼokwu ya. O nyere iwu ka e meere ya ihe ọ chọrọ.
[10] O ziri ozi ka e bipụ isi Jọn nʼụlọ mkpọrọ.
[11] E tinyere isi ya nʼefere bunye nwaagbọghọ ahụ. Ọ naara ya bulaara nne ya.
[12] Ndị na-eso ụzọ ya bịara buru ozu ya gaa lie. Ha gara kọọrọ Jisọs ihe mere.
[13] Mgbe Jisọs nụrụ akụkọ a, ọ banyere nʼụgbọ mmiri gaa nʼọzara, ebe ọ ga-anọdụrụ onwe ya. Ma mgbe igwe mmadụ nụrụ ya, ha si obodo dị iche iche sooro ya nʼukwu ala.
[14] Mgbe o sitere nʼụgbọ mmiri ahụ rịdata, ọ hụrụ oke igwe mmadụ. O nwere ọmịiko nʼebe ha nọ, gwọọ ndị ọrịa nʼetiti ha.
[15] Nʼoge anyasị ụbọchị ahụ, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị ya, “Chi na-achọ iji. Ebe a abụkwaghị ebe ndị mmadụ bi. O nweghị nri a ga-azụta nʼọzara a. Zilaga igwe mmadụ ndị a ka ha gaa nʼime obodo zụọra onwe ha nri.”
[16] Ma Jisọs gwara ha sị, “Ọ dịghị mkpa na ha ga-ala. Nyenụ ha nri ka ha rie.”
[17] Ha zara ya sị, “Ọ bụ naanị ogbe achịcha ise na azụ abụọ ka anyị nwere.”
[18] Ọ sịrị ha, “Wetaranụ m ha nʼebe a.”
[19] Ọ gwara igwe mmadụ ahụ ka ha nọdụ ala nʼahịhịa. O weere ogbe achịcha ise na azụ abụọ ahụ welie anya ya elu nye Chineke ekele. Ọ nyawara achịcha ahụ, nye ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya nyere ha igwe mmadụ ahụ.
[20] Onye ọbụla riri rijuo afọ. Emesịa, ndị na-eso ụzọ Jisọs tụtụkọtara iberibe achịcha dara nʼala tụtụjuo ha nkata iri na abụọ.
[21] Ma ndị riri nri ahụ dị puku ụmụ nwoke ise, nʼagụnyeghị ụmụ nwanyị, na ụmụntakịrị.
[22] Mgbe nke a gasịrị, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha banye nʼụgbọ malite ịgafe ofe ọzọ nke osimiri ahụ. Ma ya onwe ya nọdụrụ maka izilaga ndị mmadụ ahụ.
[23] Mgbe ọ zilagasịrị igwe mmadụ ahụ, ọ rigooro nʼelu ugwu ikpe ekpere, naanị ya. Mgbe oge anyasị ruru, naanị ya nọkwa na-ebe ahụ.
[24] Ma nʼoge a ụgbọ mmiri ahụ esitela nʼebe ala dị nso gamie nʼelu osimiri, ebili mmiri na-ebugharịkwa ya, nʼihi na ifufe ahụ na-emegide ya.
[25] Ma ihe dị ka site nʼelekere atọ ruo elekere isii nke ụtụtụ, Jisọs bịakwutere ha, na-aga ije nʼelu osimiri.
[26] Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-aga ije nʼelu osimiri ahụ, obi lọrọ ha mmiri, ha sị, “Ọ bụkwanụ mmụọ o!” Ha tiri mkpu nʼihi egwu.
[27] Ma ngwangwa Jisọs sịrị ha, “Nweenụ obi ike! O bụ m; unu atụla egwu.”
[28] Pita zara ya, “Onyenwe anyị, ọ bụrụ na ọ bụ gị, sị m bịakwute gị nʼelu mmiri.”
[29] Ọ sịrị ya, “Bịa!” Pita sitere nʼụgbọ ahụ pụta, bido ịga ije nʼelu mmiri ijekwuru Jisọs.
[30] Ma mgbe ọ hụrụ oke ebili mmiri ahụ ka ọ na-amagharị; egwu tụrụ ya. Ma mgbe ọ malitere imikpu nʼime mmiri ahụ, o tiri mkpu sị, “Onyenwe m! Zọpụta m!”
[31] Na-atụfughị oge, Jisọs setịpụrụ aka ya dọpụta Pita. Ọ sịrị ya, “Gị onye okwukwe nta, nʼihi gịnị ka i ji nwee obi abụọ!”
[32] Ma mgbe ha rịbanyere nʼime ụgbọ ahụ ifufe ahụ kwụsịkwara.
[33] Ndị ahụ nọ nʼụgbọ ahụ kpọrọ isiala nye ya sị, “Nʼezie, ị bụ Ọkpara Chineke.”
[34] Mgbe ha gafere nʼofe nke ọzọ, ha bịarutere nʼala Genesaret.
[35] Mgbe ndị obodo ahụ matara na ọ bụ ya, ha zisara ozi gburugburu obodo niile ahụ, ma dutere ya ndị niile ahụ na-adịghị ike.
[36] Ha rịọrọ ya ka o kwenye ka ha metụ ọ bụladị ọnụ uwe ya aka. Ndị niile metụrụ ya aka ka a gwọrọ.