[1] Abụ m onye hụrụla ahụhụ site na mkpara igwe nke nrubiga oke nke iwe Onyenwe anyị.
[2] O sitela nʼihu ya chụpụ m, mee ka m jegharịa nʼọchịchịrị kama nʼìhè.
[3] Nʼezie, ọ tụgharịala aka ya megide m, mgbe mgbe, ogologo ụbọchị niile.
[4] O meela ka akpụkpọ ahụ na anụ ahụ m fịkpọọ, ọ nyajisiela ọkpụkpụ di m nʼahụ.
[5] O busola m agha, jiri ihe ilu na oke mkpagbu gbaa m gburugburu.
[6] O meela ka m biri nʼọchịchịrị dịka ndị nwụrụ anwụ kemgbe oge gara aga.
[7] Ọ gbachibidola m ogige, ime ka m ghara ịgbapụ; o jirila ụdọ igwe dị arọ mee ka m ghara ijegharị.
[8] Ọ na-eme ka ekpere m hapụ irute ya, ọ bụladị mgbe m kpọkuru ya ka o nyere m aka.
[9] O jirila nkume a wara awa gbachie ụzọ m niile, o meela ka okporoụzọ m gbagọọ agbagọ.
[10] Dịka anụ ọhịa bịa nke makpu na-eche nche, na dịka ọdụm nke na-ezo onwe ya,
[11] o sitela nʼokporoụzọ dọkpụrụ m dọbisie m ahụ, hapụ m na-enweghị onye inyeaka.
[12] Ọ dọọla ụta ya mee m ka m bụrụ onye àkụ ya ga-agbata.
[13] O ji àkụ nke si nʼakpa àkụ ya gbapuo m obi.
[14] Aghọrọ m ihe ọchị nye ndị m niile; ha ji abụ na-akwa m emo ogologo ụbọchị niile.
[15] O meela ka ihe niile na-elu ilu ju m afọ, meekwa ka m ṅụjuo oluilu afọ.
[16] O meela ka m jiri okwute tajisie eze m, o kponyekwala m ntụ nʼọnụ m.
[17] Enweghị m udo, echezọkwaala m ihe ọganihu bụ.
[18] Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa. Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka Onyenwe anyị nweta.”
[19] Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m, ya na ihe ilu na oluilu.
[20] Mgbe m na-echeta ya, obi m na-ada mba nʼime m.
[21] Ma ọ dị ihe m na-echeta nʼobi m nke na-eme ka m nwee olileanya.
[22] Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke Onyenwe anyị na-emeghị ka anyị gwụsịa, nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ.
[23] Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile; ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike.
[24] Mkpụrụobi m na-ekwu, “Onyenwe anyị bụ oke m, nʼihi ya, aga m enwe nchekwube na ya.”
[25] Onyenwe anyị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya, e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike.
[26] Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọ chere nzọpụta nke Onyenwe anyị.
[27] Ọ bụ ihe dị mma ka mmadụ buru ibu arọ dịrị ya mgbe ọ bụ okorobịa.
[28] Ya nọrọkwa duu naanị ya, nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị bokwasịrị ya ibu ahụ.
[29] Ya tinye ihu ya nʼaja, nʼihi na olileanya nwere ike dịrị.
[30] Ya cheziere onye ahụ chọrọ iti ya ihe ntị ya, ya kwerekwa ka ihe ihere ju ya afọ.
[31] Nʼihi na Onyenwe anyị adịghị ajụ onye ọbụla ruo mgbe ebighị ebi.
[32] Ọ bụ ezie na ọ na-eme ka mmekpa ahụ bịa, ma ọ na-emesịakwa gosi obi ebere ya, nʼihi na ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ, dị ukwuu.
[33] Nʼihi na ọ naghị elezi anya eweta ahụhụ, maọbụ mee ka ụmụ mmadụ nọọ na mmekpa ahụ.
[34] Iji ụkwụ zọgbuo ndị mkpọrọ nọ nʼala ahụ
[35] ime ka ihe ruru mmadụ hapụ iru ya aka nʼihu Onye kachasị ihe niile elu,
[36] ime ka ikpe ziri ezi ghara irute mmadụ. Ọ bụ na Onyenwe anyị agaghị ahụ ihe ndị a?
[37] Onye pụrụ ikwu okwu mekwa ka ọ dị ire ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị enyeghị iwu ka ọ dị otu ahụ?
[38] Ọ bụghị site nʼọnụ Onye kachasị ihe niile elu ka ihe ọma na ihe ọjọọ si abịa?
[39] Gịnị mere mmadụ dị ndụ ga-eji tamuo ntamu mgbe ọ na-ahụ ahụhụ nʼihi mmehie ya?
[40] Ka anyị nyochaanụ ụzọ anyị nwapụta ya. Ka anyị lọghachikwutenụ Onyenwe anyị.
[41] Ka anyị welie aka anyị abụọ na obi anyị elu nye Chineke nọ nʼeluigwe, sị:
[42] “Anyị emehiela, nupu isi, ma ị gbagharabeghị.
[43] “I jirila iwe kpuchie onwe gị, si otu a chụọ anyị ọsọ. I gbuola anyị, jụ imere anyị ebere.
[44] I jiri igwe ojii kpuchie onwe gị ka ekpere anyị ghara irute gị.
[45] I meela ka anyị ghọọ unyi na ihe a zachapụrụ azachapụ nʼetiti mba niile.
[46] “Ndị iro anyị niile asaghepụla ọnụ ha megide anyị.
[47] Anyị ahụọla ahụhụ site nʼoke ihe egwu na ihe ndaba dị iche iche, na mbibi na ịla nʼiyi.”
[48] Anya mmiri nke dịka iyi na-asọ asọ si nʼanya m na-asọpụta nʼihi ndị m a lara nʼiyi.
[49] Anya mmiri si m nʼanya ga-anọgide na-asọpụta na-akwụsịghị akwụsị,
[50] tutu ruo mgbe Onyenwe anyị ga-esite nʼeluigwe ledata anya ma hụ.
[51] Ihe anya m na-ahụ na-ewetara mkpụrụobi m ihe mgbu, nʼihi ọnọdụ nke ndị inyom niile nọ nʼime obodo m.
[52] Ndị ahụ mere onwe ha ndị iro m, ndị m na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla, na-achụ m ọsọ dịka m bụ nnụnụ.
[53] Ha gbalịrị ime ka m nwụọ nʼime olulu site nʼịtụ m nkume.
[54] Mmiri kpuchiri m isi, echere m na-efuola m.
[55] Esitere m na nsọtụ olulu ahụ kpọkuo aha gị, gị Onyenwe anyị.
[56] Ị nụrụ arịrịọ m rịọrọ gị, “Biko, emechila ntị gị. Nụrụ arịrịọ inyeaka nke m na-arịọ gị.”
[57] Ị bịara nso mgbe m kpọkuru gị. Ị sịrị, “Atụla egwu.”
[58] Gị onwe gị, Onyenwe anyị, kpechitere ọnụ m, gị gbapụtara ndụ m.
[59] Onyenwe anyị, ị hụla ihe ọjọọ ha mere m. Kpechitere m ọnụ m.
[60] Ị hụla ịbọ ọbọ ha niile na nzube niile ha na-ezube megide m.
[61] Onyenwe anyị, ị nụla nkọcha niile ha na-akọcha m na nzube niile ha na-ezube megide m.
[62] Ị na-anụ izu na ntamu nke ndị iro m megide m ogologo ụbọchị niile.
[63] Lee ha! Ha na-akọcha m mgbe ha guzoro ọtọ, na-akọcha m mgbe ha nọdụrụ ala. Ha ji abụ na-akọcha m.
[64] Onyenwe anyị, biko, kwụghachi ha ihe ruuru ha, nʼihi ihe niile aka ha rụpụtara.
[65] Jiri ihe mkpudo kpuchie obi ha. Meekwa ka ịbụ ọnụ gị dịkwasị ha.
[66] Site nʼiwe gị chụọ ha ọsọ. Laakwa ha nʼiyi nʼiwe gị, ka ha ghara ịdịkwa nʼokpuru eluigwe nke Onyenwe anyị ọzọ.