Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 6:46

[1] Abụ m onye hụrụla ahụhụ site na mkpara igwe nke nrubiga oke nke iwe Onyenwe anyị.

[2] O sitela nʼihu ya chụpụ m, mee ka m jegharịa nʼọchịchịrị kama nʼìhè.

[3] Nʼezie, ọ tụgharịala aka ya megide m, mgbe mgbe, ogologo ụbọchị niile.

[4] O meela ka akpụkpọ ahụ na anụ ahụ m fịkpọọ, ọ nyajisiela ọkpụkpụ di m nʼahụ.

[5] O busola m agha, jiri ihe ilu na oke mkpagbu gbaa m gburugburu.

[6] O meela ka m biri nʼọchịchịrị dịka ndị nwụrụ anwụ kemgbe oge gara aga.

[7] Ọ gbachibidola m ogige, ime ka m ghara ịgbapụ; o jirila ụdọ igwe dị arọ mee ka m ghara ijegharị.

[8] Ọ na-eme ka ekpere m hapụ irute ya, ọ bụladị mgbe m kpọkuru ya ka o nyere m aka.

[9] O jirila nkume a wara awa gbachie ụzọ m niile, o meela ka okporoụzọ m gbagọọ agbagọ.

[10] Dịka anụ ọhịa bịa nke makpu na-eche nche, na dịka ọdụm nke na-ezo onwe ya,

[11] o sitela nʼokporoụzọ dọkpụrụ m dọbisie m ahụ, hapụ m na-enweghị onye inyeaka.

[12] Ọ dọọla ụta ya mee m ka m bụrụ onye àkụ ya ga-agbata.

[13] O ji àkụ nke si nʼakpa àkụ ya gbapuo m obi.

[14] Aghọrọ m ihe ọchị nye ndị m niile; ha ji abụ na-akwa m emo ogologo ụbọchị niile.

[15] O meela ka ihe niile na-elu ilu ju m afọ, meekwa ka m ṅụjuo oluilu afọ.

[16] O meela ka m jiri okwute tajisie eze m, o kponyekwala m ntụ nʼọnụ m.

[17] Enweghị m udo, echezọkwaala m ihe ọganihu bụ.

[18] Nʼihi ya, ana m ekwu, “Ịma mma m ọbụla adịghịkwa. Agaghị m enwetakwa ihe ndị ahụ m lere anya na m ga-esi nʼaka Onyenwe anyị nweta.”

[19] Ana m echeta ahụhụ m, na mwagharị m, ya na ihe ilu na oluilu.

[20] Mgbe m na-echeta ya, obi m na-ada mba nʼime m.

[21] Ma ọ dị ihe m na-echeta nʼobi m nke na-eme ka m nwee olileanya.

[22] Ọ bụ nʼihi ịhụnanya dị ukwuu nke Onyenwe anyị na-emeghị ka anyị gwụsịa, nʼihi na obi ebere ya adịghị agwụ agwụ.

[23] Ha na-adị ọhụrụ ụtụtụ niile; ikwesi ntụkwasị obi gị bụ ihe kwudosiri ike.

[24] Mkpụrụobi m na-ekwu, “Onyenwe anyị bụ oke m, nʼihi ya, aga m enwe nchekwube na ya.”

[25] Onyenwe anyị dị mma nʼebe ndị olileanya ha dị nʼime ya, e, nʼebe obi ahụ dị, nke na-achọsi ya ike.

[26] Ọ bụ ihe dị mma iji nwayọọ chere nzọpụta nke Onyenwe anyị.

[27] Ọ bụ ihe dị mma ka mmadụ buru ibu arọ dịrị ya mgbe ọ bụ okorobịa.

[28] Ya nọrọkwa duu naanị ya, nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị bokwasịrị ya ibu ahụ.

[29] Ya tinye ihu ya nʼaja, nʼihi na olileanya nwere ike dịrị.

[30] Ya cheziere onye ahụ chọrọ iti ya ihe ntị ya, ya kwerekwa ka ihe ihere ju ya afọ.

[31] Nʼihi na Onyenwe anyị adịghị ajụ onye ọbụla ruo mgbe ebighị ebi.

[32] Ọ bụ ezie na ọ na-eme ka mmekpa ahụ bịa, ma ọ na-emesịakwa gosi obi ebere ya, nʼihi na ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ, dị ukwuu.

[33] Nʼihi na ọ naghị elezi anya eweta ahụhụ, maọbụ mee ka ụmụ mmadụ nọọ na mmekpa ahụ.

[34] Iji ụkwụ zọgbuo ndị mkpọrọ nọ nʼala ahụ

[35] ime ka ihe ruru mmadụ hapụ iru ya aka nʼihu Onye kachasị ihe niile elu,

[36] ime ka ikpe ziri ezi ghara irute mmadụ. Ọ bụ na Onyenwe anyị agaghị ahụ ihe ndị a?

[37] Onye pụrụ ikwu okwu mekwa ka ọ dị ire ma ọ bụrụ na Onyenwe anyị enyeghị iwu ka ọ dị otu ahụ?

[38] Ọ bụghị site nʼọnụ Onye kachasị ihe niile elu ka ihe ọma na ihe ọjọọ si abịa?

[39] Gịnị mere mmadụ dị ndụ ga-eji tamuo ntamu mgbe ọ na-ahụ ahụhụ nʼihi mmehie ya?

[40] Ka anyị nyochaanụ ụzọ anyị nwapụta ya. Ka anyị lọghachikwutenụ Onyenwe anyị.

[41] Ka anyị welie aka anyị abụọ na obi anyị elu nye Chineke nọ nʼeluigwe, sị:

[42] “Anyị emehiela, nupu isi, ma ị gbagharabeghị.

[43] “I jirila iwe kpuchie onwe gị, si otu a chụọ anyị ọsọ. I gbuola anyị, jụ imere anyị ebere.

[44] I jiri igwe ojii kpuchie onwe gị ka ekpere anyị ghara irute gị.

[45] I meela ka anyị ghọọ unyi na ihe a zachapụrụ azachapụ nʼetiti mba niile.

[46] “Ndị iro anyị niile asaghepụla ọnụ ha megide anyị.

[47] Anyị ahụọla ahụhụ site nʼoke ihe egwu na ihe ndaba dị iche iche, na mbibi na ịla nʼiyi.”

[48] Anya mmiri nke dịka iyi na-asọ asọ si nʼanya m na-asọpụta nʼihi ndị m a lara nʼiyi.

[49] Anya mmiri si m nʼanya ga-anọgide na-asọpụta na-akwụsịghị akwụsị,

[50] tutu ruo mgbe Onyenwe anyị ga-esite nʼeluigwe ledata anya ma hụ.

[51] Ihe anya m na-ahụ na-ewetara mkpụrụobi m ihe mgbu, nʼihi ọnọdụ nke ndị inyom niile nọ nʼime obodo m.

[52] Ndị ahụ mere onwe ha ndị iro m, ndị m na-emeghị ihe ọjọọ ọbụla, na-achụ m ọsọ dịka m bụ nnụnụ.

[53] Ha gbalịrị ime ka m nwụọ nʼime olulu site nʼịtụ m nkume.

[54] Mmiri kpuchiri m isi, echere m na-efuola m.

[55] Esitere m na nsọtụ olulu ahụ kpọkuo aha gị, gị Onyenwe anyị.

[56] Ị nụrụ arịrịọ m rịọrọ gị, “Biko, emechila ntị gị. Nụrụ arịrịọ inyeaka nke m na-arịọ gị.”

[57] Ị bịara nso mgbe m kpọkuru gị. Ị sịrị, “Atụla egwu.”

[58] Gị onwe gị, Onyenwe anyị, kpechitere ọnụ m, gị gbapụtara ndụ m.

[59] Onyenwe anyị, ị hụla ihe ọjọọ ha mere m. Kpechitere m ọnụ m.

[60] Ị hụla ịbọ ọbọ ha niile na nzube niile ha na-ezube megide m.

[61] Onyenwe anyị, ị nụla nkọcha niile ha na-akọcha m na nzube niile ha na-ezube megide m.

[62] Ị na-anụ izu na ntamu nke ndị iro m megide m ogologo ụbọchị niile.

[63] Lee ha! Ha na-akọcha m mgbe ha guzoro ọtọ, na-akọcha m mgbe ha nọdụrụ ala. Ha ji abụ na-akọcha m.

[64] Onyenwe anyị, biko, kwụghachi ha ihe ruuru ha, nʼihi ihe niile aka ha rụpụtara.

[65] Jiri ihe mkpudo kpuchie obi ha. Meekwa ka ịbụ ọnụ gị dịkwasị ha.

[66] Site nʼiwe gị chụọ ha ọsọ. Laakwa ha nʼiyi nʼiwe gị, ka ha ghara ịdịkwa nʼokpuru eluigwe nke Onyenwe anyị ọzọ.

Abụ Akwa — Chapters