Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 1:41

[1] Mgbe ahụ, Jona sitere nʼafọ azụ ahụ kpeere Onyenwe anyị Chineke ekpere.

[2] Ọ sịrị, “Esitere m nʼahụhụ m kpọkuo Onyenwe anyị, ọ zakwara m. Nʼafọ ala mmụọ ka m si tikuo gị, ị nụkwara olu akwa m.

[3] Ị tụnyere m nʼime mmiri dị omimi, nʼetiti oke osimiri. Osimiri dịkwa m gburugburu, ebili mmiri gị na mmali mmiri gị gabigakwara m nʼisi.

[4] Mgbe ahụ, asịrị m, ‘E sitela nʼihu gị chụpụ m; ma otu ọ dị, aga m elegidekwa anya m ọzọ nʼebe ụlọnsọ ukwu gị dị.’

[5] Mmiri gbara m gburugburu, ruo nʼolu m, ogbu mmiri na-erikpu m. Achara mmiri kekụkwara m nʼisi.

[6] Arịdaruola m nʼala ugwu ugwu nke osimiri, ala ahụ ihe ntụchi ya niile kpachitara m ruo mgbe ebighị ebi. Ma i meela ka m si nʼolulu pụta na ndụ, Onyenwe anyị, bụ Chineke m.

[7] “Mgbe mmụọ m na-ada mba nʼike nʼike, e chetara m gị Onyenwe anyị, ma ekpere m bịakwutere gị, nʼime ụlọnsọ ukwu gị dị nsọ.

[8] “Ndị na-arapara nʼarụsị dị iche iche na-enweghị uru ha bara, na-agbakụta ebere Chineke azụ.

[9] Ma ọ bụ olu abụ ekele ka mụ onwe m ga-eji chụọrọ gị aja. Aga m akwụghachi nkwa niile m kwere. Nʼihi na ‘Nzọpụta bụ nke Onyenwe anyị.’ ”

[10] Mgbe ahụ, Onyenwe anyị nyere azụ ahụ iwu, nke mere ka ọ gbọpụta Jona nʼala akọrọ.

Jona — Chapters