[1] Lee, eze ga-achị nʼezi omume na-abịa, ya na ndịisi kwesiri ntụkwasị obi, ndị ga-ekpe ikpe ziri ezi.
[2] Onye ọbụla nʼime ha ga-aghọrọ ndị mmadụ ebe a na-ezere ndụ nʼoge oke ifufe, na ebe mgbaba nʼoge oke mmiri ozuzo. Ha ga-adị ka mmiri na-asọ nʼọzara, maọbụ dịka ndo nke nkume dị elu na-enye nʼebe okpomọkụ na-eweta ike ọgwụgwụ dị.
[3] Mgbe ahụ, agaghị emechikwa anya ndị niile na-ahụ ụzọ, agakwaghị eme ka ntị na-anụ ihe kwụsị ịnụ ihe.
[4] Ọ bụladị obi ndị nzuzu nʼetiti ha ga-ejupụta nʼakọnuche na nghọta, ndị ahụ na-asụ nsụ ga-ekwukwa okwu nke ọma.
[5] Nʼụbọchị ahụ, a gaghị ahụkwa onye nzuzu sị na ọ bụ onye maara ihe. A gaghị enyekwa onye aghụghọ nsọpụrụ ọzọ.
[6] Nʼihi na ndị nzuzu na-ekwu okwu na-echeghị echiche, obi ha niile dị na-ime ajọ ihe. Ọ na-ebi ndụ asọpụrụghị Chineke, na-ekwusakwa okwu njehie megide Onyenwe anyị; ndị agụụ na-agụ ka ha na-agbaba aka ndị akpịrị na-akpọ nkụ, ha adịghị enye ha mmiri ọṅụṅụ.
[7] Ndị ọjọọ na-eji ụzọ aghụghọ niile eme ihe ọjọọ, ha na-echepụta nzube ajọ ihe niile, iji okwu ụgha laa onye ogbenye nʼiyi, ọ bụladị mgbe arịrịọ nke onye ahụ nọ na mkpa bụ nke ziri ezi.
[8] Ma onye a na-asọpụrụ na-atụpụta atụmatụ dị ezi mma, ọ na-eguzokwa chịm nye ezi ihe.
[9] Unu ndị inyom na-ebi ndụ ndị afọ juru, bilie ọtọ, gee m ntị; unu ndị ada ndị nwere ntụkwasị obi, nụrụnụ ihe m nwere ikwu.
[10] Nʼoge na-adịghị anya, mgbe otu afọ na abalị ole na ole gasịrị, unu bụ ndị nwere ntụkwasị obi ga-ama jijiji; nʼihi na mkpụrụ ubi vaịnị unu ga-emebi, owuwe mkpụrụ ihe ubi agaghị abịa.
[11] Maanụ jijiji, unu ndị inyom afọ juru, tụọ egwu unu ndị ada ndị nwere ntụkwasị obi. Yipụnụ uwe ọma unu, kekwasịnụ onwe unu akwa mkpe.
[12] Tienụ aka nʼobi nʼihi ubi unu na-enye afọ ojuju, nʼihi osisi vaịnị na-amị mkpụrụ.
[13] Nʼihi na ogwu na uke ga-epupụta nʼala unu. Ruonụ uju, nʼihi na ụlọ niile unu na-anọ nʼime ya enwe obi ụtọ, na obodo niile unu na-anọ nʼime ya na-eri, na-aṅụ agakwaghị adị.
[14] Nʼihi na a ga-ahapụ ebe niile e wusiri ike, gbahapụkwa obodo ahụ ụzụ na-adị nʼime ya; ụlọ elu nche niile na ebe niile ewusiri ike ga-abụ ebe ga-atọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi, ha ga-aghọ ebe ịnyịnya ibu ọhịa ga na-enwe obi ụtọ, na ebe igwe anụ ụlọ ga na-akpa nri ha.
[15] Ha niile ga-adịgide otu a tutu ruo mgbe a ga-esite nʼeluigwe wụkwasị anyị Mmụọ Nsọ. Mgbe ahụ ọzara ga-aghọ ala ubi mara mma, ala ubi ọma ahụ ga-adịkwa ka ọhịa.
[16] A ga-emekwa ka ikpe ziri ezi ga-ebi nʼọzara, ezi omume ga-adịkwa nʼubi ọma ahụ.
[17] Mkpụrụ nke ezi omume ahụ ga-abụ udo; ihe ga-esikwa na ya pụta ga-abụ ị nọ jụụ na ntụkwasị obi mgbe niile ebighị ebi.
[18] Ndị m ga-ebi nʼebe obibi nke udo, nʼụlọ nwere ezi nchekwa, nʼebe izuike nke nsogbu na-adịghị.
[19] A sikwa na mkpụrụ mmiri ezoo nʼoke ọhịa niile, a sikwa na e bibie obodo niile,
[20] ndị a gọziri agọzi ka unu ga-abụ, mgbe unu na-agha mkpụrụ unu nʼakụkụ iyi, mgbe ehi unu na ịnyịnya ibu unu na-akpagharị na-aga ebe ọbụla ha chọrọ.