[1] Kraịst emeela ka anyị pụọ nʼohu, nʼihi anyị inwere onwe anyị. Ya mere, gbalịanụ ịhụ na unu e nyeghị onwe unu nʼọnọdụ ohu ọzọ.
[2] Geenụ m ntị, mụ onwe m bụ Pọl na-agwa unu nke a. Ọ bụrụ na unu anabata obibi ugwu, Kraịst agaghị abara unu uru ọbụla.
[3] Ka m kwuokwa ya ọzọ, onye ọbụla kweere ka e bie ya ugwu ji ụgwọ idebezu iwu niile ahụ.
[4] E kewapụla unu nʼebe Kraịst nọ, unu ndị a ga-agụnye na ndị ezi omume site nʼiwu. Unu adapụla nʼamara ya.
[5] Nʼihi na anyị onwe anyị nwere olileanya na site nʼike nke Mmụọ Nsọ, a ga-agụ anyị na ndị ezi omume site nʼokwukwe anyị.
[6] Nʼihi nʼime Kraịst Jisọs, obibi ugwu maọbụ ebighị ugwu abaghị uru. Ihe dị mkpa bụ okwukwe nke na-egosi onwe ya site nʼịhụnanya.
[7] Unu na-agbabu ọsọ nke ọma, onye gbochiri unu ikwenyere eziokwu ahụ?
[8] Ụdị nkwagide ahụ esiteghị nʼebe Onye ahụ kpọrọ unu bịa.
[9] Nwantịntị ihe na-eko achịcha na-eme ka ogbe ụtụ ọka a gwọrọ agwọ koo.
[10] Enwere m ntụkwasị obi nʼime Onyenwe anyị na unu agaghị eche echiche nʼụdị a ọzọ, ma ikpe ọmụma ga-adịrị onye ọbụla na-eduhie unu ọzọ.
[11] Ụmụnna m, ọ bụrụ nʼezie na m na-ekwusa mkpa obibi ugwu dị, gịnị mere e ji nọgide na-akpagbu m? Ọ bụrụ na m mee otu ahụ, ewepụla m ihe ọdachi ahụ dị nʼobe.
[12] Ọ gaara atọ m ụtọ ma ọ bụrụ na ndị ahụ na-esogbu unu ga-eme onwe ha ndị onozi.
[13] Nʼihi na e meela ka unu nwere onwe unu, ụmụnna m, ma unu ekwela ka mnwere onwe unu bụrụ ohere nye anụ ahụ unu, kama werenụ ịhụnanya na-agbara ibe unu odibo.
[14] Nʼihi na ọ bụrụ na a chịkọta iwu niile nʼotu, ihe iwu niile na-ekwu bụ nke a, “Na-ahụnụ ndị ọzọ nʼanya dịka unu si hụ onwe unu nʼanya.”
[15] Ọ bụrụ na unu na-akọcha ibe unu, na-eji ọnụ unu na-ekwutọ ha, kpacharanụ anya ka unu hapụ ịla onwe unu nʼiyi.
[16] Ana m agwa unu nke a: na-adịnụ ndụ nke Mmụọ Nsọ na-achị, unu anọkwala nʼọchịchọ nke anụ ahụ.
[17] Nʼihi na ihe anụ ahụ chọrọ dị iche nʼihe Mmụọ Nsọ chọrọ. Ihe Mmụọ Nsọ chọrọ dịkwa iche nʼihe anụ ahụ chọrọ. Ịgba mgba dị nʼetiti ha na-eme ka ị hapụ inwe ike mee ihe ị chọrọ ime.
[18] Ma ọ bụrụ na Mmụọ Nsọ na-edu unu, unu anọkwaghị nʼokpuru iwu.
[19] Ugbu a, ọrụ nke anụ ahụ pụtara ihe: ịkwa iko, adịghị ọcha na agụụ ịkwa iko.
[20] Ikpere arụsị, iri amụsụ, ibu iro nʼobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu.
[21] Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ana m adọ unu aka na ntị dịka m gwara unu nʼoge gara aga, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nʼalaeze Chineke.
[22] Ma mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ bụ, ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachiobi, na obiọma, na ịdị mma, na ikwesi ntụkwasị obi,
[23] ịdị nwayọọ, na ijide onwe. Ọ dịkwaghị iwu na-emegide ihe ndị a.
[24] Ma ndị niile bụ ndị Kraịst Jisọs akpọgidela anụ ahụ ha, ya na ọchịchọ ha nʼelu obe.
[25] Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ mmụọ, ka nzọ ụkwụ anyị bụrụ nke mmụọ na-eduzi.
[26] Ka anyị ghara ịbụ ndị mpako si otu a na-akpali iwe na ekworo nʼetiti anyị.