Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 4:09

[1] Mgbe ị batara nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị inweta, biri nʼime ya, ọ bụrụ na ị hụ otu onye e gburu egbu ka ọ tọgbọ nʼime ọhịa, ma ị maghị onye gburu ya,

[2] ndị okenye gị, na ndị ikpe ga-apụta, tụọ ịdị anya nke obodo niile dị gburugburu ọhịa ahụ, site nʼebe ahụ onye ahụ e gburu egbu tọgbọ.

[3] Ndị okenye obodo ahụ ga-ewere nwa nne ehi a na-ejibeghị rụọ ọrụ, maọbụ nyara yoku ọbụla

[4] ha ga-eduru ya gaa na ndagwurugwu nke mmiri na-eru nʼime ya, ndagwurugwu a na-egwuzebeghị mgbe ọbụla ịrụ ọrụ ubi nʼime ya, nke a na-akụghị mkpụrụ nʼime ya, gbajie olu nwaagbọghọ ehi ahụ nʼebe ahụ.

[5] Ndị nchụaja, ụmụ Livayị, ga-abịa, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị ahọpụtala ha ka ha bụrụ ndị na-ejere ya ozi. Ha ka ọ họpụtakwara ikwupụta ngọzị nʼaha Onyenwe anyị, na ikpe niile metụtara mmerụ ahụ.

[6] Mgbe ahụ, ndị okenye niile nke obodo ndị ahụ dịkarịsịrị ozu ahụ nso, ga-akwọ aka ha nʼelu nwaagbọghọ ehi ahụ, nke ahụ a gbajiri olu nʼime ndagwurugwu ahụ.

[7] Ha ga-ekwupụta sị, “Aka anyị dị ọcha, ọ bụghị anyị gburu nwoke a, anyị amakwaghị onye gburu ya.

[8] Onyenwe anyị, kpuchiere ndị gị Izrel mmehie ha, bụ ndị gị ị gbapụtara. Agụla ndị gị dịka ndị ikpe mara nʼihi ọnwụ nwoke a na-emeghị ihe ọjọọ.” Otu a ka a ga-esi kpuchie mmehie nʼihi mwụfu ọbara ahụ.

[9] Nʼụzọ dị otu a, ka ị ga-esi wezugara onwe gị ikpe ọmụma gaara abụ nke gị nʼihi ọbara onye ahụ nwụrụ anwụ, ebe ọ bụ na i meela ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị.

[10] Mgbe ị pụrụ ibuso ndị iro gị agha, ọ bụrụ na Onyenwe anyị Chineke gị emee ka i merie ndị iro gị, dọta ụfọdụ nʼime ha nʼagha,

[11] ọ bụrụ na ị hụ nwaagbọghọ mara mma nke masịrị gị nʼetiti ndị a dọtara nʼagha, i nwere ike iduru ya ka ọ bụrụ nwunye gị.

[12] Ị ga-akpọbata ya nʼụlọ gị, mee ka ọ kpụcha agịrị isi ya, bekwaa mbọ ya niile,

[13] yipụ uwe ahụ o yi mgbe e jidere ya. Ọ ga-anọdụ nʼụlọ gị ruo ụjụ nʼihi nna ya na nne ya otu ọnwa. Emesịa, i nwere ike ịbakwuru ya ghọọ di ya, ya onwe ya ga-aghọkwa nwunye gị.

[14] Ọ bụrụ na ihe ya amasịkwaghị gị, ị ga-ahapụ ya ka ọ gaa ebe ọbụla ọ chọrọ. Ị gaghị ere ya nʼọnụ ego ọbụla maọbụ kpasi ya agwa dịka ohu, ebe ọ bụ na ị wedala ya nʼala site nʼịhụ ọtọ ya anya.

[15] Ọ bụrụ na nwoke lụrụ ndị inyom abụọ, ma hụ otu nʼime ha nʼanya karịa nke ọzọ, ọ bụrụkwa na ndị inyom abụọ ahụ mụtaara ya ụmụ ndị ikom, ma nwanyị ahụ ọ kpọrọ asị buuru ụzọ mụta nwa nwoke,

[16] mgbe nwoke ahụ na-eke ihe onwunwe ya, ọ gaghị ewere oke ruuru ọkpara ya, nke nwanyị ahụ ọ kpọrọ asị mụtara kenye nwa nwoke nke nwanyị ahụ ọ hụrụ nʼanya mụrụ.

[17] Ọ ga-anabata nwa nwoke nke nwanyị ahụ ọ na-ahụghị nʼanya mụtara dị ka ọkpara, nye ya, oke abụọ site nʼihe niile o nwere. Nʼihi na nwoke ahụ bụ mmalite ume ya, ọnọdụ nke ị bụ ọkpara bụkwa nke ya.

[18] Ọ bụrụ na nwoke amụta nwa nwoke na-eme isiike, nke na-enupu isi, onye na-adịghị ege nna ya na nne ya ntị, ọ bụladị mgbe ha dọrọ ya aka na ntị.

[19] Nne ya na nna ya ga-eduru ya gaa nʼihu ndị okenye, nʼọnụ ụzọ ama obodo ha.

[20] Ha ga-agwa ndị okenye obodo ahụ, “Nwa anyị nwoke a na-eme isiike, na-enupu isi, ọ dịghị ege ntị nʼolu anyị. Ọ bụ onye mmefu na onye na-aṅụbiga mmanya oke.”

[21] Ndị ikom niile nke obodo ahụ ga-ewere nkume tugbuo ya. Nʼụzọ dị otu a, unu ga-ekpochapụ ihe ọjọọ ahụ nʼetiti unu. Ndị Izrel niile ga-anụ ihe mere, ụjọ ga-atụkwa ha.

[22] Ọ bụrụ na nwoke ọbụla emee ihe ọjọọ kwesiri ọnwụ, ọ bụrụ na e kpee ya ikpe ọnwụ, kwụgbuo ya nʼosisi,

[23] unu agaghị ahapụ ozu ya ka ọ dịgide nʼelu osisi abalị ahụ niile. Hụnụ na e liri ya nʼotu ụbọchị ahụ, nʼihi na onye ọbụla a kwụbara nʼelu osisi bụ onye Chineke bụrụ ọnụ. Emerụla ala ahụ Onyenwe anyị Chineke gị na-enye gị dịka ihe nketa.

Diuteronomi — Chapters