Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 3:45

[1] Ugbu a, ụmụnna, banyere oge na mgbe ihe ndị a ga-emezu. Echeghị m na ọ dị mkpa i degara unu akwụkwọ.

[2] Dị ka unu maara nke ọma na ụbọchị Onyenwe anyị ga-abịa dị ka onye ohi si abịa nʼabalị.

[3] Mgbe ha ga na-asị udo, na nchekwa dị, mgbe ahụ, na mberede, mbibi ga-abịakwasị ha dị ka ihe mgbu sị adakwasị nwanyị ime na-eme, nke ga-eme ka onye ọbụla ghara inwe ike ịgbapụ.

[4] Ma unu onwe unu, ụmụnna, anọghị nʼọchịchịrị, nke ụbọchị ahụ ga-abịakwasị unu na mberede dịka onye ohi.

[5] Unu niile bụ ụmụ nke ìhè na ụmụ nke ehihie, anyị abụkwaghị nke ọchịchịrị maọbụ nke abalị.

[6] Nʼihi nke a, ka anyị ghara ịdị na-arahụ ụra dị ka ndị ọzọ, kama ka anyị mụrụ anya ka anya dokwaa anyị.

[7] Nʼihi na abalị bụ mgbe ndị na-arahụ ụra ji arahụ ụra. Ọ bụkwa nʼabalị ka ndị mmanya na-egbu na-aṅụbiga mmanya oke.

[8] Ma ebe anyị niile bụ ndị nke ihe, ka anyị bụrụ ndị anya doro, ndị yi okwukwe na ịhụnanya dịka ihe ikpuchi obi, yikwasịkwa olileanya nke nzọpụta dị ka okpu igwe.

[9] Nʼihi na Chineke akwadebeghị ikpe ọmụma na egwu nye anyị. Kama ka anyị nweta nzọpụta site nʼokwukwe anyị nwere nʼOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.

[10] Ọ nwụrụ nʼihi anyị ka ọ bụrụ, ma anyị dị ndụ ma anyị nwụrụ anwụ, anyị ga-esoro ya dịrị ndụ.

[11] Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọbụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme.

[12] Anyị na-arịọsị unu ike, ụmụnna, ka unu na-asọpụrụ ndị niile na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼihi unu, ndị ahụ na-elekọta unu nʼime ọrụ Onyenwe anyị, na ndị ahụ na-adụ unu ọdụ.

[13] Ka unu na-akwanyere ha ugwu site nʼịhụnanya nʼihi ụdị ọrụ ha na-arụ. Ka unu na mmadụ ibe unu birikwa nʼudo.

[14] Ma ugbu a, anyị na-arịọ unu, ụmụnna, na-adụnụ ndị na-anọ nkịtị ọdụ, na-agbanụ ndị dara mba ume, nyerenụ ndị na-adịghị ike aka, nwekwanụ ndidi nʼebe ha niile nọ.

[15] Ka onye ọbụla ghara inyeghachi mmadụ ibe ya ihe ọjọọ nʼọnọdụ ihe ọjọọ. Kama gbalịsienụ ike ime ezi ihe nʼebe ibe unu nọ na nʼebe mmadụ niile nọ.

[16] Na-aṅụrịnụ ọṅụ oge niile.

[17] Na-ekpenụ ekpere oge niile na-esepụghị aka.

[18] Na-enyenụ ekele mgbe niile banyere ihe niile, nʼihi na nke a bụ ọchịchọ Chineke banyere unu ndị bụ nke Kraịst Jisọs.

[19] Unu emenyụla ọkụ Mmụọ Nsọ.

[20] Ọzọ unu eledala okwu ndị amụma anya.

[21] Kama na-anwalenụ ihe niile ma na-ejidesikwanụ ihe niile dị mma aka ike.

[22] Wezuganụ onwe unu nʼihe ọjọọ niile.

[23] Ka Chineke ya onwe ya, bụ Chineke nke udo, doo unu nsọ nʼụzọ niile. Ka e debezuo mmụọ unu na mkpụrụobi unu na anụ ahụ unu nsọ, na-enweghị ntụpọ ọbụla ruo ụbọchị ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.

[24] Onye ahụ kpọrọ unu ga-emezu ihe ndị a, nʼihi na ọ bụ onye kwesiri ntụkwasị obi.

[25] Biko ụmụnna, na-ekperenụ anyị ekpere.

[26] Werenụ isurita ọnụ dị nsọ na-ekele ụmụnna anyị dum.

[27] Iwu m na-enye unu site nʼaha Onyenwe anyị bụ ka unu gụpụta akwụkwọ a nʼihu ụmụnna niile.

[28] Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere unu niile.

1 Ndị Tesalonaịka — Chapters