Skip to content
Opens in a new window
Listen to this chapter • 4:06

[1] Mgbe ndị Filistia buuru igbe ọgbụgba ndụ Chineke, ha si Ebeneza buru ya buga Ashdọd.

[2] Ha butere igbe ọgbụgba ndụ Chineke, buba ya nʼime ụlọ Dagọn, dọba ya nʼakụkụ Dagọn.

[3] Mgbe ndị Ashdọd tetara nʼisi ụtụtụ echi ya, ma lee, Dagọn adaala, kpuo ihu ya nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. Ha bulikwara Dagọn elu doghachi ya nʼọnọdụ ya.

[4] Ma nʼụtụtụ echi ya, Dagọn adakwala kpuo ihu nʼala nʼihu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. Isi ya na aka ya abụọ dakapụrụ, tọgbọrọ na mbata ọnụ ụzọ, Ọ bụkwa naanị ogwe ahụ ya fọdụrụ.

[5] Ọ bụ nke a mere, site mgbe ahụ ruo taa, ndị nchụaja Dagọn na ndị niile na-abata nʼụlọ Dagọn, adịghị azọ ụkwụ ha nʼọnụ ụzọ mbata ụlọ Dagọn dị nʼAshdọd.

[6] Aka Onyenwe anyị malitere ịdị arọ nʼahụ ndị Ashdọd, ha na obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu, o ji etuto dị iche iche menye ha egwu ma bibiekwa ha nʼAshdọd nʼoke ala ya niile.

[7] Mgbe ndị Ashdọd hụrụ ihe na-eme, ha sịrị, “Anyị achọghị ka igbe ọgbụgba ndụ Chineke nke Izrel dịrị nʼetiti anyị, nʼihi na aka ya dị ike nʼahụ anyị, otu aka ahụkwa na chi anyị Dagọn.”

[8] Ya mere, ha ziri ozi kpọkọta ndịisi ndị Filistia niile, jụọ ha sị, “Gịnị ka anyị ga-eme igbe chi ndị Izrel?” Ha zara, “Ka e buru igbe chi ndị Izrel buga ya nʼobodo Gat.” Ya mere ha buuru igbe Chineke nke Izrel buga Gat.

[9] Ma mgbe ha bubatara ya na Gat, aka Onyenwe anyị malitere imegide obodo ahụ. O tinyere ndị obodo ahụ nʼọnọdụ oke egwu. O tiri ndị bi nʼobodo ahụ ihe otiti, ma nwantakịrị ma dimkpa, etuto dị iche iche toro ha nʼahụ.

[10] Ya mere, ha zilara igbe ahụ Ekrọn. Ma mgbe igbe ahụ na-abata Ekrọn, ndị Ekrọn kwara akwa sị, “Ha e burula igbe ọgbụgba ndụ chi ndị Izrel butere anyị, ka anyị na ndị anyị nwụsịa!”

[11] Ya mere, ha kpọkọtara ndịisi ndị Filistia niile sị ha, “Sinụ nʼobodo zipụ igbe chi ndị Izrel, maọbụ zighachinụ ya nʼobodo e si bute ya na mbụ, ka ọ hapụ igbuchapụ anyị na ndị anyị.” Nʼihi egwu maka ọnwụ ejidela ndị niile bi nʼobodo. Aka Chineke dịkwa ike nke ukwuu megide obodo ahụ.

[12] Ndị na-anwụghị ka e mere ka etuto jupụta ha nʼahụ, mkpu akwa nke ndị obodo ahụ ruru eluigwe.

1 Samuel — Chapters